Native Bible

Nehemiah 10:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị.

Nehemiah 10:33 in English

Nehemiah 10:33 · Berean Standard Bible

for the showbread, for the regular grain offerings and burnt offerings, for the Sabbath offerings, for the New Moons and appointed feasts, for the holy offerings, for the sin offerings to make atonement for Israel, and for all the duties of the house of our God.

Context

31“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ. 32“Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu shekel afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke, 33maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị. 34“Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu. 35“Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.