Native Bible

Nehemiah 10:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị Izrel a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu Chineke, nke o nyere site nʼaka Mosis, bụ ohu Chineke; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị.

Nehemiah 10:29 in English

Nehemiah 10:29 · Berean Standard Bible

hereby join with their noble brothers and commit themselves with a sworn oath to follow the Law of God given through His servant Moses and to carefully obey all the commandments, ordinances, and statutes of the LORD our Lord.

Context

27Maluk, Harim na Baana. 28“Ndị ọzọ fọdụrụ bụ ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị nche, ndị ọbụ abụ, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ndị ahụ niile sitere nʼirube isi nʼiwu Chineke wezuga onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ ahụ bi ha gburugburu nọ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị niile tozuru ịghọta ihe. 29Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị Izrel a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu Chineke, nke o nyere site nʼaka Mosis, bụ ohu Chineke; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị. 30“Anyị kpebikwara na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom agaghị alụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ. 31“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.