Nehum 1:15
Nahum 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam. 1:8 Ọ bụ Ninive ka a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe
Nahum 1:15 in English
Nahum 1:15 · Berean Standard Bible
Look to the mountains— the feet of one who brings good news, who proclaims peace! Celebrate your feasts, O Judah; fulfill your vows. For the wicked will never again march through you; they will be utterly cut off.
Context
13Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu,
tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.” 14Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive:
“Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị.
Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi,
bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile.
Aga m akwadokwa ili gị,
nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.” 15Lee, nʼelu ugwu niile
ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị,
bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị!
Mee mmemme gị niile gị Juda,
mezukwaa nkwa niile i kwere.
Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha,
nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.
1:8 Ọ bụ Ninive ka a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.