Nehum 1:14
Nahum 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”
Nahum 1:14 in English
Nahum 1:14 · Berean Standard Bible
The LORD has issued a command concerning you, O Nineveh: “There will be no descendants to carry on your name. I will cut off the carved image and cast idol from the house of your gods; I will prepare your grave, for you are contemptible.”
Context
12Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ,
ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga.
Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ,
ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ. 13Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu,
tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.” 14Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive:
“Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị.
Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi,
bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile.
Aga m akwadokwa ili gị,
nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.” 15Lee, nʼelu ugwu niile
ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị,
bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị!
Mee mmemme gị niile gị Juda,
mezukwaa nkwa niile i kwere.
Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha,
nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.
1:8 Ọ bụ Ninive ka a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.