Native Bible

Nahum 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.

Nahum 1:12 in English

Nahum 1:12 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “Though they are allied and numerous, yet they will be cut down and pass away. Though I have afflicted you, O Judah, I will afflict you no longer.

Context

10Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. 11Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ. 12Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ. 13Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.” 14Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.