Native Bible

Mark 7:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.

Mark 7:9 in English

Mark 7:9 · Berean Standard Bible

He went on to say, “You neatly set aside the command of God to maintain * your own tradition.

Context

7Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’* 8Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.” 9Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya. 10Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’* na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’* 11Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.