Mark 7:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’*
Mark 7:7 in English
Mark 7:7 · Berean Standard Bible
They worship Me in vain; they teach as doctrine the precepts of men.’*
Context
5Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?” 6Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị,
“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,
ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 7Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu,
ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’* 8Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.” 9Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.