Mark 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”
Mark 7:8 in English
Mark 7:8 · Berean Standard Bible
You have disregarded the commandment of God to keep the tradition of men.*”
Context
6Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị,
“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,
ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 7Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu,
ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’* 8Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.” 9Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya. 10Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’* na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.