Mark 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha.
Mark 6:5 in English
Mark 6:5 · Berean Standard Bible
So He could not perform any miracles there, except to lay His hands on a few of the sick and heal them.
Context
3Onye a ọ bụghị onye kapinta* ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef,* Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ. 4Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.” 5Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha. 6Enweghị okwukwe ha juru ya anya. 7(6) O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe. (7) Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.