Mark 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye a ọ bụghị onye kapinta* ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef,* Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ.
Mark 6:3 in English
Mark 6:3 · Berean Standard Bible
Isn’t this the carpenter, the son of Mary and the brother of James, Joses,* Judas, and Simon? Aren’t His sisters here with us as well?” And they took offense at Him.
Context
1Ọ sitere nʼebe ahụ pụọ laghachi nʼobodo nke a mụrụ ya. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa. 2Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya.
Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ? 3Onye a ọ bụghị onye kapinta* ahụ? Ọ bụghị nwa Meri, bụrụkwa nwanne Jemis, Josef,* Judas na Saimọn? Ụmụnne ya ndị inyom ha esoghị anyị nọrọ nʼebe a?” Iwe were ha nʼebe ọ nọ. 4Ma Jisọs zara ha sị, “Onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọbụla nʼobodo a mụrụ ya, na nʼetiti ndị ikwu ya na nʼezinaụlọ o siri pụta.” 5Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.