Native Bible

Mark 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(6) O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe. (7) Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha.

Mark 6:7 in English

Mark 6:7 · Berean Standard Bible

Then Jesus called the Twelve to Him and began to send them out two by two, giving them authority over unclean spirits.

Context

5Ọ rụghị ọrụ ebube ọbụla nʼebe ahụ. Ihe o mere bụ naanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nʼisi gwọọ ha. 6Enweghị okwukwe ha juru ya anya. 7(6) O jegharịkwara nʼobodo nta niile gburugburu na-ezi ihe. (7) Ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya, nye ha ikike zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha. 8Ndị a bụ iwu o nyere: “Unu ewerekwala ihe ọbụla maka njem a, karịkwa mkpanaka. Unu ewela achịcha, maọbụ akpa, unu etinyela ego ọbụla nʼime belịt unu. 9Yirinụ akpụkpọụkwụ unu, unu eyikwala karịa otu uwe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.