Mak 4:13
Mark 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ?
Mark 4:13 in English
Mark 4:13 · Berean Standard Bible
Then Jesus said to them, “Do you not understand this parable? Then how will you understand any of the parables?
Context
11Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu, 12nke mere na,
“ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla,
ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla,
ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’* ” 13Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ? 14Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke. 15Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.