Mak 4:11
Mark 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu,
Mark 4:11 in English
Mark 4:11 · Berean Standard Bible
He replied, “The mystery of the kingdom of God has been given to you, but to those on the outside everything is expressed in parables,
Context
9Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” 10Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ. 11Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu, 12nke mere na,
“ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla,
ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla,
ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’* ” 13Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.