Mak 4:14
Mark 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke.
Mark 4:14 in English
Mark 4:14 · Berean Standard Bible
The farmer sows the word.
Context
12nke mere na,
“ ‘Ha ga na-ele anya, hụkwa, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla,
ha ga na-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla,
ma ọ bụghị ya, ha nwere ike chigharịa bụrụ ndị a gbaghaara.’* ” 13Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ? 14Ọgha mkpụrụ ahụ na-agha okwu Chineke. 15Mmadụ ụfọdụ dị ka mkpụrụ ndị ahụ dara nʼakụkụ ụzọ, ebe a kụrụ okwu ahụ. Ngwangwa ha nụrụ ya, ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nke a kụrụ nʼime ha. 16Ndị ọzọ dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼala nkume. Ha nụrụ okwu ahụ, were ọṅụ nabata ya nʼotu mgbe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.