Mak 15:5
Mark 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
Mark 15:5 in English
Mark 15:5 · Berean Standard Bible
But to Pilate’s amazement, Jesus made no further reply.
Context
3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe. 4Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.” 5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya. 6Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ. 7Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.