Mak 15:3
Mark 15:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
Mark 15:3 in English
Mark 15:3 · Berean Standard Bible
And the chief priests began to accuse Him of many things.
Context
1Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet. 2Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?”
Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe. 4Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.” 5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.