Native Bible

Mark 15:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.

Mark 15:7 in English

Mark 15:7 · Berean Standard Bible

And a man named Barabbas was imprisoned with the rebels who had committed murder during the insurrection.

Context

5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya. 6Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ. 7Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ. 8Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha. 9Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.