Mak 13:16
Mark 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya.
Mark 13:16 in English
Mark 13:16 · Berean Standard Bible
And let no one in the field return for his cloak.
Context
14“Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị* (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu 15Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla. 16Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya. 17Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ. 18Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.