Mak 11:12
Mark 11:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya.
Mark 11:12 in English
Mark 11:12 · Berean Standard Bible
The next day, when they had left Bethany, Jesus was hungry.
Context
10“Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!”
“Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!” 11Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani. 12Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya. 13Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ. 14Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.