Native Bible

Micah 7:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.

Micah 7:18 in English

Micah 7:18 · Berean Standard Bible

Who is a God like You, who pardons iniquity and passes over the transgression of the remnant of His inheritance— who does not retain His anger forever, because He delights in loving devotion?*

Context

16Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha, nʼime ịdị ike ha niile. Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha, ntị ga-echikwa ha. 17Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị. 18Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere. 19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 20Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi, gosikwa Ebraham ịhụnanya gị, dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi, site na mgbe ochie. 7:3 Maọbụ, ikpe ziri ezi

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.