Maika 7:18
Micah 7:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
Micah 7:18 in English
Micah 7:18 · Berean Standard Bible
Who is a God like You, who pardons iniquity and passes over the transgression of the remnant of His inheritance— who does not retain His anger forever, because He delights in loving devotion?*
Context
16Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha,
nʼime ịdị ike ha niile.
Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha,
ntị ga-echikwa ha. 17Ha ga-aracha aja dịka agwọ,
na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala.
Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta.
Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.
Ha ga-atụkwa egwu gị. 18Onye bụ chi ahụ dịka gị,
nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie
nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?
Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,
kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere. 19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ.
Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya,
Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 20Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi,
gosikwa Ebraham ịhụnanya gị,
dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi,
site na mgbe ochie.
7:3 Maọbụ, ikpe ziri ezi
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.