Maika 7:17
Micah 7:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.
Micah 7:17 in English
Micah 7:17 · Berean Standard Bible
They will lick the dust like a snake, like reptiles slithering on the ground. They will crawl from their holes in the presence of the LORD our God; they will tremble in fear of You.
Context
15“Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta,
aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.” 16Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha,
nʼime ịdị ike ha niile.
Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha,
ntị ga-echikwa ha. 17Ha ga-aracha aja dịka agwọ,
na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala.
Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta.
Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.
Ha ga-atụkwa egwu gị. 18Onye bụ chi ahụ dịka gị,
nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie
nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?
Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,
kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere. 19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ.
Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya,
Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.