Native Bible

Micah 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.

Micah 7:19 in English

Micah 7:19 · Berean Standard Bible

He will again have compassion on us; He will vanquish our iniquities. You will cast out all our sins into the depths of the sea.

Context

17Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị. 18Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere. 19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 20Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi, gosikwa Ebraham ịhụnanya gị, dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi, site na mgbe ochie. 7:3 Maọbụ, ikpe ziri ezi

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.