Maika 7:19
Micah 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Micah 7:19 in English
Micah 7:19 · Berean Standard Bible
He will again have compassion on us; He will vanquish our iniquities. You will cast out all our sins into the depths of the sea.
Context
17Ha ga-aracha aja dịka agwọ,
na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala.
Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta.
Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.
Ha ga-atụkwa egwu gị. 18Onye bụ chi ahụ dịka gị,
nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie
nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị?
Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi,
kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere. 19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ.
Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya,
Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 20Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi,
gosikwa Ebraham ịhụnanya gị,
dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi,
site na mgbe ochie.
7:3 Maọbụ, ikpe ziri ezi
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.