Matiu 6:14
Matthew 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu.
Matthew 6:14 in English
Matthew 6:14 · Berean Standard Bible
For if you forgive men their trespasses, your heavenly Father will also forgive you.
Context
12Gbaghara anyị mmehie anyị,
dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị. 13Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa,
kama, zọpụta anyị nʼaka ajọ onye ahụ.’* 14Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu. 15Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu. 16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.