Native Bible

Matthew 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.

Matthew 3:4 in English

Matthew 3:4 · Berean Standard Bible

John wore a garment of camel’s hair, with a leather belt around his waist. His food was locusts and wild honey.

Context

2“Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” 3Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”* 4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 5Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. 6Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.