Native Bible

Matthew 3:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.”

Matthew 3:2 in English

Matthew 3:2 · Berean Standard Bible

and saying, “Repent, for the kingdom of heaven is near.”

Context

1Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ, 2“Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” 3Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”* 4Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.