Matiu 27:30
Matthew 27:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe.
Matthew 27:30 in English
Matthew 27:30 · Berean Standard Bible
Then they spit on Him and took the staff and struck Him on the head repeatedly.
Context
28Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. 29Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” 30Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe. 31Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe. 32Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.