Native Bible

Matthew 27:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie.

Matthew 27:28 in English

Matthew 27:28 · Berean Standard Bible

They stripped Him and put a scarlet robe on Him.

Context

26Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe. 27Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha,* mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu. 28Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. 29Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” 30Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.