Native Bible

Matthew 15:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.

Matthew 15:8 in English

Matthew 15:8 · Berean Standard Bible

‘These people honor Me with their lips, but their hearts are far from Me.

Context

6Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu. 7Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Mgbe o kwuru sị, 8“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. 9Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu,* ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’* ” 10Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ, sị ha, “Geenụ ntị, ghọtakwanụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.