Matiu 15:12
Matthew 15:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwa na obi adịghị ndị Farisii mma nʼihi okwu ahụ i kwuru?”
Matthew 15:12 in English
Matthew 15:12 · Berean Standard Bible
Then the disciples came to Him and said, “Are You aware that the Pharisees were offended when they heard this?”
Context
10Mgbe ahụ, ọ kpọrọ igwe mmadụ ahụ, sị ha, “Geenụ ntị, ghọtakwanụ. 11Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nʼọnụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe sị nʼọnụ onye ahụ pụta na-emerụ ya.” 12Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwa na obi adịghị ndị Farisii mma nʼihi okwu ahụ i kwuru?” 13Ma ọ zara sị ha, “Osisi ọbụla Nna m nke eluigwe na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-ehopu. 14Ya mere, unu echegbula onwe unu, nʼihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì ibe ya ha abụọ adaba nʼime olulu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.