Matiu 11:28
Matthew 11:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
Matthew 11:28 in English
Matthew 11:28 · Berean Standard Bible
Come to Me, all you who are weary and burdened, and I will give you rest.
Context
26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a. 27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. 28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike. 29Nyaranụ yoku* nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike. 30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
11:5 Ọrịa a bụ ekpenta, a bụghị ka anyị si mara ya nʼala anyị, kama ọ bụ aha ndị Griik ji mara ọrịa niile dị iche iche nke na-emetụta akpụkpọ ahụ.
11:10 Mal 3:1
11:25 Maọbụ, ana m eto gị
11:29 Maọbụ, ịyagba
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.