Native Bible

Matthew 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.

Matthew 1:17 in English

Matthew 1:17 · Berean Standard Bible

In all, then, there were fourteen generations from Abraham to David, fourteen from David to the exile to Babylon, and fourteen from the exile to the Christ.

Context

15Eliud mụrụ Elieza, Elieza amụọ Matan, Matan amụọ Jekọb. 16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ. 18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst* siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.