Matiu 1:18
Matthew 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst* siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.
Matthew 1:18 in English
Matthew 1:18 · Berean Standard Bible
This is how the birth of Jesus Christ came about: His mother Mary was pledged in marriage to Joseph, but before they came together, she was found to be with child through the Holy Spirit.
Context
16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 17Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ. 18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst* siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.