Luk 23:54
Luke 23:54 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso.*
Luke 23:54 in English
Luke 23:54 · Berean Standard Bible
It was Preparation Day, and the Sabbath was beginning.*
Context
52Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs.* 53Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ. 54Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso.* 55Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya. 56Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.*
23:17 Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Mat 27:15 na Mak 15:6.
23:30 Hos 10:8
23:36 Mat 27:48
23:47 Maọbụ, onye aka ya dị ọcha
23:52 Jọn onye Arimatia bụ onye na-eso Jisọs na nzuzo Jọn 19:38.
23:54 Ndị na-edebe ụbọchị izuike nʼala anyị, na-akwadobe ihe ha niile nke ọma nʼụbọchị fụraịdee, nʼihi na ụbọchị izuike na-ebido nʼoge ọdịda anyanwụ nʼụbọchị ahụ.
23:56 Ọpụ 35:2 na Lev 23:3 nakwa Dit 5:14
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.