Native Bible

Luke 22:57 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.”

Luke 22:57 in English

Luke 22:57 · Berean Standard Bible

But Peter denied it. “Woman, I do not know Him,” he said.

Context

55Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala. 56Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.” 57Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.” 58Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.” Ma Pita kwuru sị, “Nwoke m, abụghị m.” 59Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.