Luk 22:56
Luke 22:56 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.”
Luke 22:56 in English
Luke 22:56 · Berean Standard Bible
A servant girl saw him seated in the firelight and looked intently at him. “This man also was with Him,” she said.
Context
54Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama ọ nọ nʼebe dị anya. 55Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala. 56Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.” 57Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.” 58Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.”
Ma Pita kwuru sị, “Nwoke m, abụghị m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.