Native Bible

Luke 20:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?”

Luke 20:4 in English

Luke 20:4 · Berean Standard Bible

John’s baptism—was it from heaven, or from men?”

Context

2Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?” 3Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m, 4baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?” 5Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 6Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.