Native Bible

Luke 20:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”

Luke 20:18 in English

Luke 20:18 · Berean Standard Bible

Everyone who falls on this stone will be broken to pieces, but he on whom it falls will be crushed.”

Context

16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.” 17O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’*? 18Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.” 19Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ. 20Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.