Luk 20:16
Luke 20:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.” Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.”
Luke 20:16 in English
Luke 20:16 · Berean Standard Bible
He will come and kill those tenants, and will give the vineyard to others.” And when the people heard this, they said, “May such a thing never happen!”
Context
14“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 15Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya.
“Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha? 16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.”
Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.” 17O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara,
“ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ
aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’*? 18Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.