Luk 20:14
Luke 20:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’
Luke 20:14 in English
Luke 20:14 · Berean Standard Bible
But when the tenants saw the son, they discussed it among themselves and said, ‘This is the heir. Let us kill him, and the inheritance will be ours.’
Context
12O zigakwara onye nke atọ, ma ha merụrụ ya ahụ, chụlaa ya. 13“Mgbe ahụ, onyenwe ubi vaịnị ahụ sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme? Aga m ezigara ha ọkpara m, nke m hụrụ nʼanya, ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ ya.’ 14“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 15Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya.
“Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha? 16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.”
Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.