Native Bible

Luke 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ.

Luke 2:3 in English

Luke 2:3 · Berean Standard Bible

And everyone went to his own town to register.

Context

1Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum.* 2(Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) 3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ. 4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.