Luke 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.
Luke 2:5 in English
Luke 2:5 · Berean Standard Bible
He went there to register with Mary, who was pledged to him in marriage and was expecting a child.
Context
3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ. 4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha. 6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. 7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.