Luk 12:33
Luke 12:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.
Luke 12:33 in English
Luke 12:33 · Berean Standard Bible
Sell your possessions and give to the poor. Provide yourselves with purses that will not wear out, an inexhaustible treasure in heaven, where no thief approaches and no moth destroys.
Context
31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. 32“Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ. 33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya. 34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.” 35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.