Luk 12:35
Luke 12:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.
Luke 12:35 in English
Luke 12:35 · Berean Standard Bible
Be dressed for service and keep your lamps burning.
Context
33Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya. 34Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.” 35“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu. 36Dịnụ ka ndị ohu na-echere nlọghachi nke nna ha ukwu, onye gara oriri agbamakwụkwọ, bụ onye ha ga-emeghere ụzọ ngwangwa mgbe ọ lọtara kụọ aka. 37Ndị ohu ahụ ga-abụ ndị a gọziri agọzi, bụ ndị onyenwe ha ga-ahụ na ha nọ na nche mgbe ọ ga-alọghachi. Nʼezie asị m unu na ọ ga-eke belịt ya nʼukwu ya, mekwa ka ha nọdụ ala na tebul iri ihe, ọ ga-abịakwa jere ha ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.