Luk 1:58
Luke 1:58 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
Luke 1:58 in English
Luke 1:58 · Berean Standard Bible
Her neighbors and relatives heard that the Lord had shown her great mercy, and they rejoiced with her.
Context
56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya. 57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. 59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, 60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.