Levitikọs 7:32
Leviticus 7:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye.
Leviticus 7:32 in English
Leviticus 7:32 · Berean Standard Bible
And you are to give the right thigh to the priest as a contribution from your peace offering.
Context
30Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. 31Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom. 32Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye. 33Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya. 34Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.