Native Bible

Leviticus 7:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya.

Leviticus 7:33 in English

Leviticus 7:33 · Berean Standard Bible

The son of Aaron who presents the blood and fat of the peace offering shall have the right thigh as a portion.

Context

31Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom. 32Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye. 33Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya. 34Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”* 35Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.