Native Bible

Leviticus 7:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja.

Leviticus 7:35 in English

Leviticus 7:35 · Berean Standard Bible

This is the portion of the offerings made by fire to the LORD for Aaron and his sons since the day they were presented to serve the LORD as priests.

Context

33Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya. 34Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ”* 35Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja. 36Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 37Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.