Levitikọs 26:42
Leviticus 26:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ.
Leviticus 26:42 in English
Leviticus 26:42 · Berean Standard Bible
then I will remember My covenant with Jacob and My covenant with Isaac and My covenant with Abraham, and I will remember the land.
Context
40“ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie* ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m, 41nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha 42aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ. 43Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi. 44Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha,* maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ* mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.