Levitikọs 26:40
Leviticus 26:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie* ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,
Leviticus 26:40 in English
Leviticus 26:40 · Berean Standard Bible
But if they will confess their iniquity and that of their fathers in the unfaithfulness that they practiced against Me, by which they have also walked in hostility toward Me—
Context
38Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu. 39Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha. 40“ ‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie* ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m, 41nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha 42aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.