Levitikọs 26:44
Leviticus 26:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha,* maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ* mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
Leviticus 26:44 in English
Leviticus 26:44 · Berean Standard Bible
Yet in spite of this, when they are in the land of their enemies, I will not reject or despise them so as to destroy them and break My covenant with them; for I am the LORD their God.
Context
42aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ. 43Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi. 44Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha,* maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ* mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha. 45Kama nʼihi ha, aga m echeta ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, ịbụ Chineke ha, ndị ahụ m kpọpụtara site nʼala Ijipt nʼihu mba niile. Abụ m Onyenwe anyị.’ ” 46Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ na ndụmọdụ Onyenwe anyị guzobere nʼugwu Saịnaị, nʼetiti ya onwe ya, na ụmụ Izrel, site nʼaka Mosis.*
26:1 Ọpụ 20:4
26:2 Lev 19:30
26:13 Ya bụ, yoku
26:40 1Jọn 1:9
26:44 Rom 11:2
26:44 Dit 4:31
26:46 Lev 7:38; 27:34
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.